Isaiah 56

Nzọpụta dịrị ndị ọzọ

1Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị,

“Debenụ ikpe ziri ezi,
meekwanụ ihe ziri ezi.
Nʼihi na nzọpụta m dị nso,
ezi omume m ga-apụta ihe mgbe na-adịghị anya.
2Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a,
bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike,
onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya,
nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.”

3Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị,
Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.”
Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị
“Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.”
4Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru:

“Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile,
ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ,
na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.
5Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya,
ihe ncheta na aha
dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi
nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi.
6Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị
ijere ya ozi,
na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya,
nakwa ị bụ ndị ohu ya,
ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya,
na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike,
7ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m,
meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m.
Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere
nʼebe ịchụ aja m.
Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m
Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.”
8Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara,
bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta,
“Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha
tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.”

Ebubo Chineke megide ndị ajọọ omume

9Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa.
Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa.
10Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì.
Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ.
Ha dị ka nkịta dara ogbi,
nke na-adịghị agbọ ụja.
Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ,
na idina ndina nʼanya.
11Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke;
ha adịghị enwe afọ ojuju.
Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta,
ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha,
onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya.
12Onye ọbụla na-asị, “Bịa ka m weta mmanya,
ka anyị ṅụjuokwa mmanya nʼaba nʼanya afọ anyị.
Echi ga-adịkwa ka taa,
ma ọ bụkwanụ dị mma karịa.”
Copyright information for IboBIU